2 Ndị Kọrint 11

Ma mgbe m nọ nʼetiti unu abụghị m ibu arọ nye onye ọbụla nʼoge mkpa m. Nʼihi na ụmụnna si Masidonia wetaara m ihe niile na-akpa m mkpa. Ebe ọ bụ na m gbalịrị debe onwe m, ka m ghara ịbụ ibu arọ nye unu nʼụzọ ọbụla nʼoge gara aga, agaghị m abụkwa ibu arọ nye unu nʼoge dị nʼihu.

2 Corinthians 11:9 (UKJV) And when I was present with you, and wanted, I was chargeable to no man: for that which was lacking to me the brethren which came from Macedonia supplied: and in all things I have kept myself from being burdensome unto you, and so will I keep myself.

7Ọ ga-abụ na-emere m ihe ọjọọ mgbe m wedara onwe m ala ka e welie unu elu, nʼihi nʼanaghị m unu ihe ọbụla mgbe m na-ekwusara unu oziọma Chineke?

8Ọ bụ nzukọ nọ nʼebe ọzọ nyeere m aka mgbe m na-arụ ọrụ nʼetiti unu. Ọ bụ site nʼaka ha ka m ji nata nkwado, dịka ụgwọ ọrụ m, ka m nwee ike inyere unu aka.

9Ma mgbe m nọ nʼetiti unu abụghị m ibu arọ nye onye ọbụla nʼoge mkpa m. Nʼihi na ụmụnna si Masidonia wetaara m ihe niile na-akpa m mkpa. Ebe ọ bụ na m gbalịrị debe onwe m, ka m ghara ịbụ ibu arọ nye unu nʼụzọ ọbụla nʼoge gara aga, agaghị m abụkwa ibu arọ nye unu nʼoge dị nʼihu.

10Ebe eziokwu nke Kraịst dị nʼime m, ịnya isi m nke a agaghị akwụsị na mpaghara Akaịa niile.

11Nʼihi gịnị? Ọ bụ nʼihi na m ahụghị unu nʼanya? Chineke maara na m hụrụ unu nʼanya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.