2Ekworo m nwere nʼebe unu nọ bụ ekworo nke Chineke. Ekwere m nkwa iwere unu nye otu di, ya bụ Kraịst, ka m nwe ike chee unu nʼihu ya dịka nwaagbọghọ dị ọcha nke na-amaghị nwoke.
3Ma ana m atụ egwu, na dịka agwọ jiri aghụghọ ghọgbuo Iiv, ndị nrafu ga-eji aghụghọ duhie unu, mee ka unu kwụsị iji obi dị ọcha na uche ziri ezi jeere Kraịst ozi.
4Nʼihi na unu gaara anara onye ọzọ bịakwutere unu na-ekwusa Jisọs ọzọ nke na-abụghị nke anyị kwusara, unu gaara anarakwa ike nke mmụọ ọzọ dị iche na-abụghị ike nke Mmụọ Nsọ ahụ unu natara, unu gaara ekwenyekwa na nkuzi ọzọ dị iche, na-abụghị oziọma ahụ nke unu natara.
5Ma echeghị m na ọ dị ụzọ ọbụla ndị ozi a maara aha ha si kara m mma.
6Ọ bụrụ na m abụghị onye ọka okwu, abụ m onye ọka mmụta. Anyị akọwarala unu nke a ọtụtụ mgbe nʼụzọ dị iche iche nʼihe niile.