2 Ndị Kọrint 4

Anyị ahapụla omume nzuzo niile na-eweta ihere. Anyị ahapụla ụzọ aghụghọ niile, maọbụ iji okwu Chineke na-atụ asị. Kama site nʼikwupụta eziokwu ahụ ka ndị mmadụ were ezi akọnuche ha mata ụdị mmadụ anyị bụ nʼihu Chineke.

2 Corinthians 4:2 (UKJV) But have renounced the hidden things of dishonesty, not walking in craftiness, nor handling the word of God deceitfully; but by manifestation of the truth commending ourselves to every man's conscience in the sight of God.

1Ya mere, ebe anyị natara ije ozi a site nʼebere Chineke, ike adịghị agwụ anyị nʼobi.

2Anyị ahapụla omume nzuzo niile na-eweta ihere. Anyị ahapụla ụzọ aghụghọ niile, maọbụ iji okwu Chineke na-atụ asị. Kama site nʼikwupụta eziokwu ahụ ka ndị mmadụ were ezi akọnuche ha mata ụdị mmadụ anyị bụ nʼihu Chineke.

3Ma a sịkwa na oziọma nke anyị na-ekwusa dịka ihe e zoro ezo, ọ bụ ihe e zoro ezo nye ndị ahụ na-ala nʼiyi.

4Nʼebe ha nọ, chi nke ụwa a ekpuchiela uche ndị na-ekweghị ekwe iji gbochie ha ịhụ ìhè nke oziọma ahụ na-ezipụta ebube Kraịst, onye dị nʼụdị Chineke nʼonwe ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.