4Nʼebe ha nọ, chi nke ụwa a ekpuchiela uche ndị na-ekweghị ekwe iji gbochie ha ịhụ ìhè nke oziọma ahụ na-ezipụta ebube Kraịst, onye dị nʼụdị Chineke nʼonwe ya.
5Nʼihi na ọ bụghị anyị onwe anyị ka anyị na-ekwusa, kama anyị na-ekwusa na Kraịst Jisọs bụ Onyenwe anyị. Ma anyị onwe anyị bụ ụmụodibo unu nʼihi Jisọs.
6Nʼihi na ọ bụ Chineke ahụ sịrị, ka ìhè si nʼọchịchịrị chawapụta; bụkwa onye mere ka ìhè ya nwuwa nʼime obi anyị. Nke a ka o mere iji wetara anyị ìhè amamihe nke ebube Chineke nʼihu Kraịst.
7Anyị onwe anyị bụ ndị natara akụ nke dị oke ọnụahịa dị nʼime ite ụrọ, iji gosi na ike kacha elu si nʼaka Chineke, ọ bụghị nʼaka anyị.
8A na-akpagbu anyị nʼakụkụ niile, ma adịghị emeri anyị. Mgbe ụfọdụ, anyị nọ na mgbagwoju anya ma anyị adịghị ada mba.