1Dịka ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ nʼotu, anyị na-arịọ arịrịọ sị unu ahapụla ịnara amara a Chineke na-enye unu nʼefu.
2Nʼihi na ọ na-ekwu, “Nʼoge m na-anara mmadụ nke ọma anụrụ m olu unu. Ọ bụkwa ụbọchị nzọpụta ka m nyeere unu aka.” Lee, ugbu a bụ oge a na-anabata mmadụ nke ọma, ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta.
3Anyị etinyeghị ihe ịsọ ngọngọ nʼụzọ onye ọbụla ka ọ ghara iwetara ọrụ anyị ihe ịta ụta.
4Kama nʼime ihe niile, anyị na-agbalịsị ike ime ka ndị mmadụ mara na anyị bụ ndị na-ejere Chineke ozi. Anyị ji ndidi na ntachiobi na-edi nsogbu niile na mkpagbu niile na ahụhụ niile na-adakwasị anyị.
5A na-eti anyị ihe otiti ọtụtụ mgbe. E tinyekwala anyị nʼime ụlọ mkpọrọ dị iche iche. Ọtụtụ mgbe ka igwe mmadụ tikwara anyị ihe otiti. Anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ. Ọtụtụ abalị anyị nọkwara nʼime ịmụ anya na-erighị nri,