2 Ndị Kọrint 6

sitekwa nʼikwu eziokwu na site nʼike Chineke. Anyị buru ezi omume dịka ngwa agha nʼaka nri na nʼaka ekpe.

2 Corinthians 6:7 (UKJV) By the word of truth, by the power of God, by the armour of righteousness on the right hand and on the left,

5A na-eti anyị ihe otiti ọtụtụ mgbe. E tinyekwala anyị nʼime ụlọ mkpọrọ dị iche iche. Ọtụtụ mgbe ka igwe mmadụ tikwara anyị ihe otiti. Anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ. Ọtụtụ abalị anyị nọkwara nʼime ịmụ anya na-erighị nri,

6nʼime ịdị ọcha na ezi nghọta na ntachiobi nke anyị nwere, nʼinwe obiọma na ezi ịhụnanya nke ihu abụọ nʼadịghị na ya nʼime Mmụọ Nsọ,

7sitekwa nʼikwu eziokwu na site nʼike Chineke. Anyị buru ezi omume dịka ngwa agha nʼaka nri na nʼaka ekpe.

8Ụfọdụ na-asọpụrụ anyị ma ndị ọzọ na-eme anyị ihe ihere. Ụfọdụ na-ata anyị ụta, ma ụfọdụ na-eto anyị. Ụfọdụ mmadụ na-agụ anyị dị ka ndị ụgha, ma anyị nọgidesịrị ike na-ekwu eziokwu.

9Ụwa amaghị anyị, ma a maara anyị. Ọ bụ ezie na anyị na ọnwụ na-anọ nso mgbe niile, ma lee anyị ka dịkwa ndụ. A na-ata anyị ahụhụ, ma lee anyị anwụghị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.