19Ma ọ bụghị naanị nke a, kama nzukọ họpụtara ya iso anyị, na inyere anyị aka dịka anyị na-ebu onyinye a, bụ ije ozi anyị na-eje nʼihi iwetara Onyenwe anyị otuto, na izipụta njikere anyị inyere ibe anyị aka.
20Anyị na-eze ka onye ọbụla ghara ịta anyị ụta nʼihe ọbụla, nʼihi ụzọ anyị si jee ozi gbasara onyinye mgbasapụ aka a.
21Ọ bụ ọchịchọ anyị ime ihe ọma, ọ bụghị naanị nʼihu Onyenwe anyị, kama nʼihu ndị mmadụ kwa.
22Ugbu a anyị na-ezitekwara unu nwanna anyị nwoke ọzọ ka o soro ha bịakwute unu, nwanna anyị a bụ onye anyị nwapụtara, onye ọ na-anụ ọkụ nʼobi inyeaka. Ugbu a, o nwekwara ntụkwasị obi dị ukwuu nʼebe unu nọ.
23Ma banyere Taịtọs, ọ bụ onye otu m nʼọrụ a, bụrụkwa onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ nʼetiti unu. Ma banyere ụmụnna anyị ndị ọzọ a, ha bụ ndị na-anọchite anya nzukọ, na ndị na-ewetara Kraịst otuto.