2 Ndị Kọrint 8

Nke ka nke, ha nyere karịa ihe anyị lere anya na ha ga-enye. Nʼihi na ha buru ụzọ were onwe ha nye Onyenwe anyị. Ha sitekwara nʼọchịchọ Chineke nyekwa anyị onwe ha.

2 Corinthians 8:5 (UKJV) And this they did, not as we hoped, but first gave their own selves to the Lord, and unto us by the will of God.

3Ana m agba ama na ha nyere dịka ike ha, ha nyekwara ọ bụladị karịa otu a tụrụ anya. Onyinye ha si nʼobi ha pụta.

4Nʼezie, ha rịọsiri anyị arịrịọ ike ka anyị nara onyinye amara ha nyere nʼihi iso keta oke inyere ndị nsọ ndị ọzọ nọ na mkpa aka.

5Nke ka nke, ha nyere karịa ihe anyị lere anya na ha ga-enye. Nʼihi na ha buru ụzọ were onwe ha nye Onyenwe anyị. Ha sitekwara nʼọchịchọ Chineke nyekwa anyị onwe ha.

6Ya mere, anyị rịọrọ Taịtọs, onye malitere ọrụ ka ọ rụzuo ọrụ amara ahụ ruo nʼisi.

7Ma ebe unu babigara ụba oke nʼihe niile unu nwere, nʼokwukwe, na okwu, nʼihe ọmụma, na ịnụ ọkụ nʼobi, na ịhụnanya unu hụrụ anyị, lezie unu anya hụ na unu babigakwara ụba oke nʼamara nke inye ihe a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.