2 Ndị Kọrint 9

Nʼihi na ije ozi nke ife ofufe a abụghị naanị nke igboro ndị nsọ mkpa ha, kama ọ bụkwa nke na-eme ka ekele ọtụtụ ndị mmadụ na-enye Chineke babiga ụba oke.

2 Corinthians 9:12 (UKJV) For the administration of this service not only supplies the lack of the saints, but is abundant also by many thanksgivings unto God;

10Ma onye ahụ na-enye onye ọrụ ubi mkpụrụ nke ọ na-agha nʼubi ya, na-enyekwa mmadụ nri ọ ga-eri, ọ ga-enyekwa unu ihe niile dị unu mkpa, meekwa ka ụlọakụ unu jupụta na mkpụrụ. Ọ ga-emekwa ka mkpụrụ ezi omume unu baa ụba.

11Ọ ga-emekwa ka unu bụrụ ndị ọgaranya nʼụzọ niile, ka unu nwee ihe ga-ezuru unu na nke unu ga-enye ndị ọzọ mgbe niile. Site nʼaka anyị, afọ ofufu unu ga-enye Chineke ekele nʼihi inyeaka unu nyere ha.

12Nʼihi na ije ozi nke ife ofufe a abụghị naanị nke igboro ndị nsọ mkpa ha, kama ọ bụkwa nke na-eme ka ekele ọtụtụ ndị mmadụ na-enye Chineke babiga ụba oke.

13Nʼihi ije ozi a, nke unu sitere na ya gosi onwe unu dịka ndị kwesiri, ndị ọzọ ga-eto Chineke nʼihi irube isi unu nke dakọtara na nkwupụta unu banyere oziọma nke Kraịst, ya na onyinye afọ ofufu nke unu na-eme ka ha na ndị ọzọ niile soro unu nwekọ.

14Nke a ga-eme nʼekpere ha maka unu, ha ga-eji obi ha niile rịọọ arịrịọ, nʼihi ịdị ukwu nke amara Chineke dị nʼime unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.