1Ọ dịghị mkpa idere unu akwụkwọ banyere ozi nke ndị nsọ.
2Amaara m na unu jikeere inyere ha aka, dịka m nyara isi nye ndị Masidonia banyere unu. Nʼihi na agwara m ha na unu ndị bi na Akaịa ejikerelarị inyere ha aka kemgbe afọ gara aga. Ọ bụkwa ịnụ ọkụ nʼobi unu kwaliri obi ha, ime ihe ha mere.
3Ugbu a, ana m ezitere unu ụmụnna anyị ndị a ka e mee ka ịnya isi nke m nyara banyere unu ghara ịbụ okwu efu. Ma dịka m gwara ha na unu ejikerela, achọrọ m ka unu jikere nye ha ihe unu chọrọ inye.
4Nʼihi na ọ bụrụ na ndị Masidonia esoro m bịa hụ na unu ejikeghị ejike, ebe anyị na-anya isi na unu ejikerela, ọ ga-abụrụ m ihe ihere, bụkwara unu ihe ihere, ebe anyị nwere ntụkwasị obi na unu ga-anọ na njikere.