2 Jọn 1

Nʼihi eziokwu ahụ nke dị nʼime anyị, nke ga-adịgidekwa nʼime anyị ruo mgbe ebighị ebi:

2 John 1:2 (UKJV) For the truth's sake, which dwells in us, and shall be with us for ever.

1Ọ bụ okenye ahụ, Na-edegara nwanyị ahụ onye Chineke họpụtara, na ụmụ ya akwụkwọ a, bụ ndị m hụrụ nʼanya nʼime eziokwu. Ọ bụghị naanị m kama ndị niile maara eziokwu ahụ.

2Nʼihi eziokwu ahụ nke dị nʼime anyị, nke ga-adịgidekwa nʼime anyị ruo mgbe ebighị ebi:

3Amara, na ebere, na udo nke sitere na Chineke Nna na Jisọs Kraịst, bụ Ọkpara Nna ahụ dịnyere anyị nʼeziokwu nʼịhụnanya.

4Apụghị m ịkọ ụdị aṅụrị m nwere mgbe m hụrụ na ụfọdụ ụmụ gị na-ebi ndụ ịgbaso eziokwu dịka ihe Nna nyere anyị nʼiwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.