3Amara, na ebere, na udo nke sitere na Chineke Nna na Jisọs Kraịst, bụ Ọkpara Nna ahụ dịnyere anyị nʼeziokwu nʼịhụnanya.
4Apụghị m ịkọ ụdị aṅụrị m nwere mgbe m hụrụ na ụfọdụ ụmụ gị na-ebi ndụ ịgbaso eziokwu dịka ihe Nna nyere anyị nʼiwu.
5Ma ugbu a, ezi nwanyị, ọ bụghị iwu ọhụrụ ka m na-edere gị kama nke ahụ e nyere anyị site na mmalite. Ana m arịọ ka anyị hụrịta ibe anyị nʼanya.
6Nke a bụ ịhụnanya ahụ: ka anyị na-ejegharị nʼirube isi nʼiwu ya niile. Dịka unu si nụ ya site na mmalite, unu ahapụkwala ijegharị nʼime ya.
7Nʼihi na ọtụtụ ndị nduhie apụọla baa nʼụwa, bụ ndị na-adịghị ekwenye na Jisọs Kraịst bịara nʼoyiyi mmadụ. Onye ọbụla dị otu a bụ onye nduhie bụrụkwa onye na-emegide Kraịst.