5Ma ugbu a, ezi nwanyị, ọ bụghị iwu ọhụrụ ka m na-edere gị kama nke ahụ e nyere anyị site na mmalite. Ana m arịọ ka anyị hụrịta ibe anyị nʼanya.
6Nke a bụ ịhụnanya ahụ: ka anyị na-ejegharị nʼirube isi nʼiwu ya niile. Dịka unu si nụ ya site na mmalite, unu ahapụkwala ijegharị nʼime ya.
7Nʼihi na ọtụtụ ndị nduhie apụọla baa nʼụwa, bụ ndị na-adịghị ekwenye na Jisọs Kraịst bịara nʼoyiyi mmadụ. Onye ọbụla dị otu a bụ onye nduhie bụrụkwa onye na-emegide Kraịst.
8Lezienụ anya, ka unu ghara itufu ụgwọ ọrụ nke anyị dọgburu onwe anyị nʼọrụ maka ya, kama ka unu nata ụgwọ ọrụ unu nʼuju.
9Onye ọbụla na-adịghị anọgide nʼozizi Kraịst, nke na-esite na ya na ewezuga onwe ya, enweghị Chineke. Ma onye ọbụla na-anọgide nʼozizi ahụ nwere Nna na Ọkpara ya.