2 Ndị Eze 1

Ọzọkwa, eze zigara otu onyeisi agha na iri ndị agha ise ọzọ ka ha gaa jide Ịlaịja. Mgbe ha bịarutere hụ Ịlaịja, onyeisi agha ahụ kpọkuru ya sị ya, “Onye nke Chineke, eze sị gị, ‘rituo, bịa ngwangwa!’ ”

2 Kings 1:11 (UKJV) Again also he sent unto him another captain of fifty with his fifty. And he answered and said unto him, O man of God, thus has the king said, Come down quickly.

9Mgbe ahụ, eze zigara otu onyeisi agha ya, na iri ndị agha ise ka ha gaa jide Ịlaịja. Mgbe ndị agha ahụ bịarutere hụ Ịlaịja ka ọ nọ ala nʼelu ugwu, onyeisi agha ahụ kpọrọ Ịlaịja sị ya, “Onye nke Chineke, eze sị gị, ‘rituo!’ ”

10Ịlaịja zara sị ha, “Ọ bụrụ na m bụ onye nke Chineke dịka i kwuru, ka ọkụ si nʼeluigwe daa rechapụ gị na iri ndị a agha ise so gị.” Otu mgbe ahụ, ọkụ sitere nʼeluigwe daa rechapụ iri ndị agha ise ahụ na onyeisi ha.

11Ọzọkwa, eze zigara otu onyeisi agha na iri ndị agha ise ọzọ ka ha gaa jide Ịlaịja. Mgbe ha bịarutere hụ Ịlaịja, onyeisi agha ahụ kpọkuru ya sị ya, “Onye nke Chineke, eze sị gị, ‘rituo, bịa ngwangwa!’ ”

12Ịlaịja zara sị ya, “Ọ bụrụ na m bụ onye nke Chineke dịka i kwuru, ka ọkụ si nʼeluigwe daa rechapụ gị na iri ndị agha ise gị na ha so.” Ngwangwa, ọkụ Chineke si nʼeluigwe daa rechapụ ha.

13Ọzọkwa, eze zigara otu onyeisi agha na iri ndị agha ise ọzọ ka ha gaa jide Ịlaịja. Mgbe ndị agha a bịara hụ Ịlaịja, onyeisi agha ahụ rigoro nʼelu ugwu gbuo ikpere nʼala nʼihu Ịlaịja rịọọ ya amara sị ya, “Onye nke Chineke, biko, meere ohu gị na iri ndị agha ise mụ na ha so ebere.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.