2 Ndị Eze 10

Emesịa, Jehu gburu ndị ikwu Ehab fọdụrụ nʼobodo Jezril, ha na ndịisi niile, na ndị enyi ya niile, na ndị nchụaja ya niile. Ọ dịkwaghị otu onye ikwu Ehab ọ hapụrụ ndụ.

2 Kings 10:11 (UKJV) So Jehu slew all that remained of the house of Ahab in Jezreel, and all his great men, and his kinsfolks, and his priests, until he left him none remaining.

9Nʼụtụtụ ya, Jehu pụrụ, guzoro nʼihu ndị niile gbakọrọ nʼebe ahụ gwa ha okwu sị, “Ndị Izrel, unu bụ ndị ezi omume. Ọ bụ mụ onwe m gbara izu ọjọọ megide nna m ukwu, gbuo ya, ma onye gburu ndị a niile?

10Matanụ nke ọma na o nweghị okwu ọbụla Onyenwe anyị kwuru megide ezinaụlọ Ehab nke na-agaghị emezu. Onyenwe anyị emeela ihe o kwere nkwa na ọ ga-eme site nʼọnụ ohu ya Ịlaịja.”

11Emesịa, Jehu gburu ndị ikwu Ehab fọdụrụ nʼobodo Jezril, ha na ndịisi niile, na ndị enyi ya niile, na ndị nchụaja ya niile. Ọ dịkwaghị otu onye ikwu Ehab ọ hapụrụ ndụ.

12Emesịakwa, Jehu hapụrụ Jezril gaa Sameria. Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ọ bịaruru ebe a na-akpọ Ebe Izuike Ndị ọzụzụ atụrụ.

13Nʼebe ahụ, o zutere ndị ụmụnna Ahazaya, eze Juda, jụọ sị, “Olee ndị ka unu bụ?” Ha zara, “Anyị bụ ndị ikwu Ahazaya, eze Juda, anyị bịara ka anyị jụọ maka ọdịmma ndị ezinaụlọ eze na nne eze.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.