2 Ndị Eze 10

Nʼụtụtụ ya, Jehu pụrụ, guzoro nʼihu ndị niile gbakọrọ nʼebe ahụ gwa ha okwu sị, “Ndị Izrel, unu bụ ndị ezi omume. Ọ bụ mụ onwe m gbara izu ọjọọ megide nna m ukwu, gbuo ya, ma onye gburu ndị a niile?

2 Kings 10:9 (UKJV) And it came to pass in the morning, that he went out, and stood, and said to all the people, All of you be righteous: behold, I conspired against my master, and slew him: but who slew all these?

7Mgbe akwụkwọ ozi ahụ rutere ha, ndị ikom ahụ kpọrọ ụmụ ndị ikom eze dị iri asaa nʼọnụọgụgụ gbuo ha niile, chịrị isi ha tinye na nkata zigara ya Jehu na Jezril.

8Mgbe onyeozi bịarutere, ọ gwara Jehu sị, “Ha ebutala isi ụmụ ndị ikom eze.” Mgbe ahụ, Jehu nyere iwu sị, “Tụkọbanụ ha ọnụ nʼoke abụọ, nʼọnụ ụzọ e si abata obodo, tutu ruo ụtụtụ.”

9Nʼụtụtụ ya, Jehu pụrụ, guzoro nʼihu ndị niile gbakọrọ nʼebe ahụ gwa ha okwu sị, “Ndị Izrel, unu bụ ndị ezi omume. Ọ bụ mụ onwe m gbara izu ọjọọ megide nna m ukwu, gbuo ya, ma onye gburu ndị a niile?

10Matanụ nke ọma na o nweghị okwu ọbụla Onyenwe anyị kwuru megide ezinaụlọ Ehab nke na-agaghị emezu. Onyenwe anyị emeela ihe o kwere nkwa na ọ ga-eme site nʼọnụ ohu ya Ịlaịja.”

11Emesịa, Jehu gburu ndị ikwu Ehab fọdụrụ nʼobodo Jezril, ha na ndịisi niile, na ndị enyi ya niile, na ndị nchụaja ya niile. Ọ dịkwaghị otu onye ikwu Ehab ọ hapụrụ ndụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.