20Jehu sịrị, “Kpọsaanụ na a ga-enwe oke mkpọkọta dị nsọ nye Baal.” Ya mere, ha kwusara ya.
21O zipụrụ ozi nye ndị bi nʼakụkụ Izrel niile. Ndị niile na-efe Baal bịazuru. Ọ dịghị onye fọdụrụ nke na-abịaghị. Ha jupụtara nʼụlọnsọ ukwu Baal site nʼotu isi ya ruo nʼisi nke ọzọ.
22Jehu sịrị onye na-elekọta ụlọ ebe a na-edebe uwe ndị na-efe ofufe na-eyi, “Chịpụta uwe nye ndị niile na-efe Baal.” Ya mere, ọ chịpụtaara ha uwe.
23Mgbe ahụ, Jehu na Jehonadab nwa Rekab, banyere nʼebe nzukọ Baal. Jehu sịrị ndị nʼefe Baal, “Chọzienụ nke ọma ka unu hụ na o nweghị onye ọbụla na-efe Onyenwe anyị nọ nʼebe a, karịakwa naanị ndị na-efe Baal.”
24Mgbe ha malitere ịchụ aja na isure ihe nsure ọkụ, Jehu emeelarị ka iri ndị agha asatọ gbaa ụlọ ahụ niile gburugburu. O nyelarị iwu sị, “Ọ bụrụ na unu ekwere ka otu onye si nʼime ụlọ a gbapụ, unu ga-eji ndụ unu kwụghachi ụgwọ onye dị otu ahụ.”