18Emesịa, Jehu kpọkọtara ndị obodo ahụ niile sị ha, “Ehab fere Baal ofufe nke nta, Jehu ga-efe ya ebe ọ dị ukwuu.
19Ugbu a, kpọkọtaanụ ndị amụma Baal niile, ndị niile na-efe ya, na ndị nchụaja ya niile. Hụnụ na onye ọbụla nʼime ha bịara, nʼihi na a ga-eme oke mmemme ịchụ aja nye Baal. Onye ọbụla e lere anya ya nʼebe ahụ, ma a hụghị ya, agaghị adị ndụ.” Ma Jehu ji aghụghọ nʼihi ka ọ laa ndị a na-efe Baal nʼiyi.
20Jehu sịrị, “Kpọsaanụ na a ga-enwe oke mkpọkọta dị nsọ nye Baal.” Ya mere, ha kwusara ya.
21O zipụrụ ozi nye ndị bi nʼakụkụ Izrel niile. Ndị niile na-efe Baal bịazuru. Ọ dịghị onye fọdụrụ nke na-abịaghị. Ha jupụtara nʼụlọnsọ ukwu Baal site nʼotu isi ya ruo nʼisi nke ọzọ.
22Jehu sịrị onye na-elekọta ụlọ ebe a na-edebe uwe ndị na-efe ofufe na-eyi, “Chịpụta uwe nye ndị niile na-efe Baal.” Ya mere, ọ chịpụtaara ha uwe.