2 Ndị Eze 10

Emesịa, Jehu kpọkọtara ndị obodo ahụ niile sị ha, “Ehab fere Baal ofufe nke nta, Jehu ga-efe ya ebe ọ dị ukwuu.

2 Kings 10:18 (UKJV) And Jehu gathered all the people together, and said unto them, Ahab served Baal a little; but Jehu shall serve him much.

16Mgbe ahụ, Jehu sịrị ya, “Ugbu a, soro m bịa lee ụdị ịnụ ọkụ nʼobi m nwere maka ọrụ Onyenwe anyị.” Ha abụọ sooro nʼụgbọ agha Jehu.

17Mgbe ha bịaruru Sameria, Jehu gburu ndị enyi na ndị ikwu Ehab niile, ndị fọdụrụ site nʼikwu Ehab, o bibiri ha dịka okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma Ịlaịja.

18Emesịa, Jehu kpọkọtara ndị obodo ahụ niile sị ha, “Ehab fere Baal ofufe nke nta, Jehu ga-efe ya ebe ọ dị ukwuu.

19Ugbu a, kpọkọtaanụ ndị amụma Baal niile, ndị niile na-efe ya, na ndị nchụaja ya niile. Hụnụ na onye ọbụla nʼime ha bịara, nʼihi na a ga-eme oke mmemme ịchụ aja nye Baal. Onye ọbụla e lere anya ya nʼebe ahụ, ma a hụghị ya, agaghị adị ndụ.” Ma Jehu ji aghụghọ nʼihi ka ọ laa ndị a na-efe Baal nʼiyi.

20Jehu sịrị, “Kpọsaanụ na a ga-enwe oke mkpọkọta dị nsọ nye Baal.” Ya mere, ha kwusara ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.