26ha bupụtara ogidi nsọ e ji efe Baal, kpọọ ha ọkụ.
27Ha kwaturu ogidi nsọ Baal, kwatukwaa ụlọ ịchụ aja ya. Ya mere e megharịrị ya ka ọ bụrụ ebe ọha mmadụ na-aga ogwe ruo taa.
28Jehu kpochapụrụ ofufe Baal nʼala Izrel niile.
29Ma otu ọ dị, o siteghị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya. Mmehie nke Jeroboam mere ka Izrel mehie, ya bụ, mmehie nke ife arụsị ụmụ ehi e ji ọlaedo kpụọ, dị na Betel na Dan.
30Onyenwe anyị gwara Jehu sị, “Nʼihi na i mere nke ọma mezuo ihe niile ziri ezi nʼanya m, nʼebe ezinaụlọ Ehab nọ, nʼusoro ihe niile dị nʼuche m ime, ụmụ ụmụ gị ga-anọkwasị nʼocheeze Izrel, ruo nʼọgbọ nke anọ ha.”