2 Ndị Eze 10

Ha kwaturu ogidi nsọ Baal, kwatukwaa ụlọ ịchụ aja ya. Ya mere e megharịrị ya ka ọ bụrụ ebe ọha mmadụ na-aga ogwe ruo taa.

2 Kings 10:27 (UKJV) And they brake down the image of Baal, and brake down the house of Baal, and made it a draught house unto this day.

25Ngwangwa Jehu chụchasịrị aja nsure ọkụ, ọ pụrụ gwa ndị agha ya, na ndịisi ha okwu sị, “Baanụ nʼime ụlọ gbuo ndị niile nọ nʼebe ahụ. Unu ekwela ka otu onye nʼime ha gbapụ.” Ha jiri mma agha gbuo ndị ahụ nọ nʼime ụlọ Baal, tụpụta ozu ha nʼezi. Emesịa, ndị agha Jehu banyere nʼime ime ụlọ ebe ịchụ aja Baal,

26ha bupụtara ogidi nsọ e ji efe Baal, kpọọ ha ọkụ.

27Ha kwaturu ogidi nsọ Baal, kwatukwaa ụlọ ịchụ aja ya. Ya mere e megharịrị ya ka ọ bụrụ ebe ọha mmadụ na-aga ogwe ruo taa.

28Jehu kpochapụrụ ofufe Baal nʼala Izrel niile.

29Ma otu ọ dị, o siteghị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya. Mmehie nke Jeroboam mere ka Izrel mehie, ya bụ, mmehie nke ife arụsị ụmụ ehi e ji ọlaedo kpụọ, dị na Betel na Dan.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.