29Ma otu ọ dị, o siteghị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya. Mmehie nke Jeroboam mere ka Izrel mehie, ya bụ, mmehie nke ife arụsị ụmụ ehi e ji ọlaedo kpụọ, dị na Betel na Dan.
30Onyenwe anyị gwara Jehu sị, “Nʼihi na i mere nke ọma mezuo ihe niile ziri ezi nʼanya m, nʼebe ezinaụlọ Ehab nọ, nʼusoro ihe niile dị nʼuche m ime, ụmụ ụmụ gị ga-anọkwasị nʼocheeze Izrel, ruo nʼọgbọ nke anọ ha.”
31Ma Jehu akpachapụghị anya iji obi ya niile debe iwu Onyenwe anyị, Chineke Izrel. O siteghị na mmehie Jeroboam wezuga onwe ya, bụ mmehie ahụ o mere ka Izrel mee.
32Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị malitere ime ka ndị Izrel bido ịdị nta. Hazael eze Aram, buru agha merie ọtụtụ akụkụ Izrel,
33nke dị nʼọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, na ala niile nke Gilead (nʼoke ala ndị Gad, na nke ndị Ruben, na Manase), site nʼAroea nke dị nʼakụkụ ndagwurugwu Anọn, ruo Gilead na Bashan.