2 Ndị Eze 10

Ma ha tụrụ egwu nʼebe ọ dị ukwuu, sị, “Lee, eze abụọ enweghị ike iguzogide ya, anyị onwe anyị ga-esi aṅaa guzogide ya?”

2 Kings 10:4 (UKJV) But they were exceedingly afraid, and said, Behold, two kings stood not before him: how then shall we stand?

2“Ugbu a, mgbe akwụkwọ a rutere unu aka, ebe unu na ụmụ ndị ikom nna unu ukwu nọ, ebe unu nwekwara ụgbọ agha na ịnyịnya, na obodo e wusiri ike na ngwa agha,

3họpụtanụ onye kachasị inwe ugwu ma kwesikwa nʼime ụmụ ndị ikom nna unu ukwu, mee ka ọ nọkwasị nʼocheeze nna ya. Mgbe ahụ, buo agha chebe ụlọ nna unu ukwu.”

4Ma ha tụrụ egwu nʼebe ọ dị ukwuu, sị, “Lee, eze abụọ enweghị ike iguzogide ya, anyị onwe anyị ga-esi aṅaa guzogide ya?”

5Ya mere, onye ọ dị nʼaka ilekọta ezinaụlọ eze, onyeisi obodo, ndị okenye na ndị niile na-elekọta ụmụ Ehab, dere akwụkwọ a zigara Jehu, sị ya, “Jehu, anyị niile bụ ndị ohu gị. Anyị jikeere ime ihe niile i gwara anyị. Anyị agaghị ahọpụta onye ọbụla dịka eze; gị onwe gị mee ihe ọbụla ị chere na ọ bụ ya kachasị mma.”

6Mgbe ahụ, Jehu degaara ha akwụkwọ nke ugboro abụọ sị ha, “Ọ bụrụ na unu dịnyeere m, ọ bụrụkwa na unu ga-erube isi nye m, chịrịnụ isi ụmụ ndị ikom nna unu ukwu, bịakwute m nʼotu oge a echi na Jezril.” Nʼoge ahụ, ụmụ eze iri ndị ikom asaa nọ nʼaka ndịisi obodo ahụ, ndị na-azụlite ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.