1Ugbu a, e nwere ụmụ Ehab ndị ikom ọnụọgụgụ ha dị iri asaa ndị nọ na Sameria, Jehu dere akwụkwọ ozi ziga Sameria, zigara ndịisi obodo Jezril, zigakwara ndị okenye na ndị na-elekọta ụmụ Ehab ndị ahụ. Ọ sịrị,
2“Ugbu a, mgbe akwụkwọ a rutere unu aka, ebe unu na ụmụ ndị ikom nna unu ukwu nọ, ebe unu nwekwara ụgbọ agha na ịnyịnya, na obodo e wusiri ike na ngwa agha,
3họpụtanụ onye kachasị inwe ugwu ma kwesikwa nʼime ụmụ ndị ikom nna unu ukwu, mee ka ọ nọkwasị nʼocheeze nna ya. Mgbe ahụ, buo agha chebe ụlọ nna unu ukwu.”
4Ma ha tụrụ egwu nʼebe ọ dị ukwuu, sị, “Lee, eze abụọ enweghị ike iguzogide ya, anyị onwe anyị ga-esi aṅaa guzogide ya?”
5Ya mere, onye ọ dị nʼaka ilekọta ezinaụlọ eze, onyeisi obodo, ndị okenye na ndị niile na-elekọta ụmụ Ehab, dere akwụkwọ a zigara Jehu, sị ya, “Jehu, anyị niile bụ ndị ohu gị. Anyị jikeere ime ihe niile i gwara anyị. Anyị agaghị ahọpụta onye ọbụla dịka eze; gị onwe gị mee ihe ọbụla ị chere na ọ bụ ya kachasị mma.”