10Nʼafọ iri atọ na asaa nke ịbụ eze Joash na Juda, ka Jehoash nwa Jehoahaz malitere ị bụ eze Izrel na Sameria. Ọ chịrị afọ iri na isii.
11O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. O siteghị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, mmehie nke Jeroboam dubara Izrel ime. Jehoash nọgidere nʼime ha.
12Akụkọ gbasara ọchịchị Jehoash, na ihe niile o mere, na ihe ọ rụpụtara, tinyere agha o buru megide Amazaya eze Juda, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha?
13Jehoash soro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, Jeroboam anọchie nʼocheeze ya. E liri Jehoash na Sameria, nʼebe e liri ndị eze Izrel ndị ibe ya.
14Nʼoge a, Ịlaisha nọ nʼọrịa nke ọ ga-esite na ya anwụ. Jehoash, bụ eze Izrel gara ịhụ ya, ọ kwara akwa mgbe ọ hụrụ ya sị, “Nna m, nna m, usuu ụgbọ agha na usuu ndị na-agba ịnyịnya Izrel!”