2 Ndị Eze 13

Ma onye nke Chineke ahụ were iwe sị ya, “Ị gaara apịa ya nʼala ugboro ise maọbụ isii. Mgbe ahụ, ị gaara enwe ike merie ndị Aram bibie ha kpamkpam. Ma ugbu a, ọ bụ naanị ugbo atọ ka ị ga-emeri ha.”

2 Kings 13:19 (UKJV) And the man of God was angry with him, and said, You should have smitten five or six times; then had you smitten Syria till you had consumed it: whereas now you shall strike Syria but three times.

17Ịlaisha gwara ya sị, “Meghee oghereikuku ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ.” O meghere ya. Mgbe ahụ Ịlaisha gwara ya sị, “Gbapụ àkụ.” Eze gbapụrụ àkụ. Ịlaisha kwuru sị, “Àkụ mmeri Onyenwe anyị, àkụ mmeri megide Aram. Ị ga-ebibi ndị Aram kpamkpam nʼAfek.”

18Ọ sịrị, “Chilite àkụ ndị ahụ,” ọ chilitere ha. Ịlaisha gwara eze Izrel, “Gbaa ha nʼala.” Ọ gbara ha nʼala ugboro atọ, ma kwụsị.

19Ma onye nke Chineke ahụ were iwe sị ya, “Ị gaara apịa ya nʼala ugboro ise maọbụ isii. Mgbe ahụ, ị gaara enwe ike merie ndị Aram bibie ha kpamkpam. Ma ugbu a, ọ bụ naanị ugbo atọ ka ị ga-emeri ha.”

20Ya mere, Ịlaisha nwụrụ. E likwara ya. Nʼoge ahụ, ọtụtụ ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike na-esi nʼala ndị Moab na-abịa nʼala Izrel izu ohi site nʼọnwa nke atọ nʼafọ ọhụrụ ọbụla.

21Otu ụbọchị, mgbe ụfọdụ ndị ikom na-eli otu nwoke nwụrụ anwụ, ha hụrụ ndị a na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Nʼihi nke a, ha mere ngwangwa site nʼụjọ tụbanye nwoke ahụ nʼili Ịlaisha. Mgbe ozu nwoke ahụ dara metụ ọkpụkpụ Ịlaisha ahụ, nwoke ahụ nwụrụ anwụ megharịrị ahụ bilie, guzo nʼụkwụ ya abụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.