15Ịlaisha gwara ya okwu sị, “Wepụta ụta na àkụ ụfọdụ.” O mere dịka Ịlaisha gwara ya.
16Ịlaisha gwakwara eze Izrel okwu sị ya, “Jide ụta ahụ nʼaka gị abụọ.” Mgbe o jidere ụta ahụ Ịlaisha tụkwasịrị aka nke ya nʼaka eze.
17Ịlaisha gwara ya sị, “Meghee oghereikuku ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ.” O meghere ya. Mgbe ahụ Ịlaisha gwara ya sị, “Gbapụ àkụ.” Eze gbapụrụ àkụ. Ịlaisha kwuru sị, “Àkụ mmeri Onyenwe anyị, àkụ mmeri megide Aram. Ị ga-ebibi ndị Aram kpamkpam nʼAfek.”
18Ọ sịrị, “Chilite àkụ ndị ahụ,” ọ chilitere ha. Ịlaisha gwara eze Izrel, “Gbaa ha nʼala.” Ọ gbara ha nʼala ugboro atọ, ma kwụsị.
19Ma onye nke Chineke ahụ were iwe sị ya, “Ị gaara apịa ya nʼala ugboro ise maọbụ isii. Mgbe ahụ, ị gaara enwe ike merie ndị Aram bibie ha kpamkpam. Ma ugbu a, ọ bụ naanị ugbo atọ ka ị ga-emeri ha.”