13Jehoash soro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, Jeroboam anọchie nʼocheeze ya. E liri Jehoash na Sameria, nʼebe e liri ndị eze Izrel ndị ibe ya.
14Nʼoge a, Ịlaisha nọ nʼọrịa nke ọ ga-esite na ya anwụ. Jehoash, bụ eze Izrel gara ịhụ ya, ọ kwara akwa mgbe ọ hụrụ ya sị, “Nna m, nna m, usuu ụgbọ agha na usuu ndị na-agba ịnyịnya Izrel!”
15Ịlaisha gwara ya okwu sị, “Wepụta ụta na àkụ ụfọdụ.” O mere dịka Ịlaisha gwara ya.
16Ịlaisha gwakwara eze Izrel okwu sị ya, “Jide ụta ahụ nʼaka gị abụọ.” Mgbe o jidere ụta ahụ Ịlaisha tụkwasịrị aka nke ya nʼaka eze.
17Ịlaisha gwara ya sị, “Meghee oghereikuku ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ.” O meghere ya. Mgbe ahụ Ịlaisha gwara ya sị, “Gbapụ àkụ.” Eze gbapụrụ àkụ. Ịlaisha kwuru sị, “Àkụ mmeri Onyenwe anyị, àkụ mmeri megide Aram. Ị ga-ebibi ndị Aram kpamkpam nʼAfek.”