23Ma Onyenwe anyị meere ha amara, nwee ọmịiko nʼebe ha nọ, ma gosikwa ha na ihe banyere ha na-emetụ ya nʼobi nʼihi ọgbụgba ndụ ya na Ebraham na Aịzik na Jekọb. Ruo taa, o kweghị ka e bibie ha, maọbụ ka e site nʼihu ya chụpụ ha.
24Emesịa, Hazael eze Aram nwụrụ, Ben-Hadad nwa ya nọchikwara nʼọnọdụ ya.
25Jehoash nwa Jehoahaz, weghachitere obodo niile nke ọ naara nʼaka nna ya Jehoahaz site nʼaka Ben-Hadad nwa Hazael. Ugboro atọ ka Jehoash meriri ya, site otu a weghachi obodo niile nke Izrel.