10Shalum nwa Jebesh, na ndị ọzọ, gbara izu ọjọọ megide ya, tigbuo ya nʼihu ndị Izrel niile. Ọ ghọkwara eze mgbe Zekaraya nwụrụ.
11Akụkọ metụtara ihe ndị ọzọ mere mgbe Zekaraya bụ eze, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha.
12Ya mere, okwu ahụ Onyenwe anyị gwara Jehu mezuru, nke bụ: “Ụmụ ụmụ gị ga-anọkwasị nʼocheeze Izrel ruo nʼọgbọ nke anọ ha.”
13Shalum nwa Jebesh malitere ịbụ eze nʼafọ nke iri atọ na itoolu nke ọchịchị Uzaya eze Juda. Ọ chịrị otu ọnwa na Sameria.
14Menahem nwa Gadi sitere nʼobodo Tịaza bịaruo Sameria gbuo Shalum nwa Jebesh ghọọ eze nʼọnọdụ ya.