2 Ndị Eze 15

Nʼafọ nke iri ise na abụọ nke ọchịchị Azaraya eze Juda ka Peka nwa Remalaya ghọrọ eze Izrel nʼobodo Sameria. Ọ chịrị dịka eze iri afọ abụọ.

2 Kings 15:27 (UKJV) In the two and fiftieth year of Azariah king of Judah Pekah the son of Remaliah began to reign over Israel in Samaria, and reigned twenty years.

25Ma Peka nwa Remalaya, otu nʼime ndịisi agha eze na iri ndị ikom ise ọzọ si Gilead gbara izu megide ya, gbuo ya nʼụlọeze dị nʼime Sameria. Ha gbukwara Agob na Arie nʼoge a ha gburu Pekahaya. Emesịa, Peka ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

26Akụkọ banyere Pekahaya na ihe niile o mere ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha.

27Nʼafọ nke iri ise na abụọ nke ọchịchị Azaraya eze Juda ka Peka nwa Remalaya ghọrọ eze Izrel nʼobodo Sameria. Ọ chịrị dịka eze iri afọ abụọ.

28O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. O fere chi ọzọ ofufe, o sighị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, bụ mmehie nke o dubara ndị Izrel nʼime ya.

29Nʼoge Peka bụ eze Izrel, ka Tiglat-Pilesa, eze Asịrịa bịara were Ijon, Ebel-Bet-Maaka, Janoa, Kedesh, Hazọ, Gilead, Galili na ala ndị Naftalị niile. Ọ chụpụrụ ndị mmadụ niile mee ka ha gaa biri nʼAsịrịa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.