1Nʼafọ nke iri na abụọ nke ọchịchị Ehaz, bụ eze Juda, ka Hoshea nwa Elaa ghọrọ eze Izrel nʼobodo Sameria. Ọ chịrị dịka eze afọ itoolu.
2O mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị mgbe ọ bụ eze. Ma ọ bụghị dịka ndị eze Izrel ndị ọzọ bu ya ụzọ.
3Shalmanesa eze Asịrịa bịara buso Hoshea agha, nʼihi na Hoshea nọ nʼokpuru ọchịchị eze Asịrịa, bụrụkwa onye na-atụ ụtụ nye ya kwa afọ.