2 Ndị Eze 17

Ma mgbe ndị Asịrịa malitere ibi nʼebe ahụ, ha atụghị egwu Onyenwe anyị, maọbụ fee ya ofufe. Nʼihi ya, Onyenwe anyị zitere ọdụm ndị batara nʼetiti ha gbuo ụfọdụ mmadụ nʼime ha.

2 Kings 17:25 (UKJV) And so it was at the beginning of their dwelling there, that they feared not the LORD: therefore the LORD sent lions among them, which slew some of them.

23tutu ruo mgbe Onyenwe anyị kpochapụrụ Izrel niile site nʼihu ya, dịka o kwuru na ọ ga-eme, site nʼọnụ ndị amụma na-ejere ya ozi. Ọ bụ nke a mere ndị Izrel ji gaa biri nʼAsịrịa dịka ndị a dọtara nʼagha ruo taa.

24Eze Asịrịa sitere nʼala Babilọn, Kuta, Ava, Hamat na Sefavaim kpọta ndị mmadụ bịara biri nʼobodo Sameria ịnọchi anya ndị Izrel niile e sitere nʼebe ahụ bupụ. Nʼụzọ dị otu a, ha nwetara Sameria birikwa nʼobodo ya niile.

25Ma mgbe ndị Asịrịa malitere ibi nʼebe ahụ, ha atụghị egwu Onyenwe anyị, maọbụ fee ya ofufe. Nʼihi ya, Onyenwe anyị zitere ọdụm ndị batara nʼetiti ha gbuo ụfọdụ mmadụ nʼime ha.

26Ya mere, e zigara eze Asịrịa ozi sị ya, “Ndị ahụ i dọtara nʼagha mee ka ha bịa biri nʼobodo Sameria amaghị ihe chi nwe ala ahụ chọrọ. O zitere ọdụm nʼetiti ha, nke na-egbu ha, nʼihi na ndị ahụ amaghị ihe ọ chọrọ.”

27Eze Asịrịa nyere iwu sị: “Ka otu onye nʼime ndị nchụaja e si na Sameria dọta nʼagha laghachi gaa biri nʼebe ahụ, izi ndị bi nʼobodo ahụ ihe chi ala ahụ chọrọ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.