2 Ndị Eze 17

tutu ruo mgbe Onyenwe anyị kpochapụrụ Izrel niile site nʼihu ya, dịka o kwuru na ọ ga-eme, site nʼọnụ ndị amụma na-ejere ya ozi. Ọ bụ nke a mere ndị Izrel ji gaa biri nʼAsịrịa dịka ndị a dọtara nʼagha ruo taa.

2 Kings 17:23 (UKJV) Until the LORD removed Israel out of his sight, as he had said by all his servants the prophets. So was Israel carried away out of their own land to Assyria unto this day.

21Mgbe Onyenwe anyị mere ka ndị Izrel dọwapụ onwe ha site nʼalaeze Devid, ha mere Jeroboam nwa Nebat, eze ha. Ma Jeroboam mere ka Izrel site nʼiso Onyenwe anyị wezuga onwe ha. O mere ka ha mee mmehie dị ukwuu.

22Ọ dịkwaghị mgbe ụmụ Izrel sitere nʼime mmehie ahụ Jeroboam dubara ha pụta,

23tutu ruo mgbe Onyenwe anyị kpochapụrụ Izrel niile site nʼihu ya, dịka o kwuru na ọ ga-eme, site nʼọnụ ndị amụma na-ejere ya ozi. Ọ bụ nke a mere ndị Izrel ji gaa biri nʼAsịrịa dịka ndị a dọtara nʼagha ruo taa.

24Eze Asịrịa sitere nʼala Babilọn, Kuta, Ava, Hamat na Sefavaim kpọta ndị mmadụ bịara biri nʼobodo Sameria ịnọchi anya ndị Izrel niile e sitere nʼebe ahụ bupụ. Nʼụzọ dị otu a, ha nwetara Sameria birikwa nʼobodo ya niile.

25Ma mgbe ndị Asịrịa malitere ibi nʼebe ahụ, ha atụghị egwu Onyenwe anyị, maọbụ fee ya ofufe. Nʼihi ya, Onyenwe anyị zitere ọdụm ndị batara nʼetiti ha gbuo ụfọdụ mmadụ nʼime ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.