2 Ndị Eze 18

Nke a mere nʼihi na ha jụrụ ige ntị nʼolu Onyenwe anyị bụ Chineke ha, jụkwa ime ihe ọ chọrọ ka ha mee. Ha edebeghị ọgbụgba ndụ ya na iwu niile Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere ha. Ha jụrụ ige ntị nʼiwu ndị a, maọbụ debe ha.

2 Kings 18:12 (UKJV) Because they obeyed not the voice of the LORD their God, but transgressed his covenant, and all that Moses the servant of the LORD commanded, and would not hear them, nor do them.

10Mgbe afọ atọ gasịrị, nʼafọ nke isii nke ọchịchị Hezekaya, na afọ nke itoolu nke ọchịchị Hoshea, bụ eze Izrel, ndị agha Asịrịa dọtara Sameria nʼagha.

11Ọ bụ nʼoge ahụ ka eze Asịrịa bupụrụ ndị Izrel niile bulaa ha Asịrịa nʼime obodo Hala, na Gozan nʼakụkụ iyi ukwu Hoboa, na nʼobodo ndị Midia.

12Nke a mere nʼihi na ha jụrụ ige ntị nʼolu Onyenwe anyị bụ Chineke ha, jụkwa ime ihe ọ chọrọ ka ha mee. Ha edebeghị ọgbụgba ndụ ya na iwu niile Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere ha. Ha jụrụ ige ntị nʼiwu ndị a, maọbụ debe ha.

13Nʼafọ nke iri na anọ nke ọchịchị eze Hezekaya, Senakerib bụ eze Asịrịa, busoro obodo Juda niile e wusiri ike agha, merikwaa ha.

14Mgbe ahụ, Hezekaya chọrọ ụzọ ọ ga-esi mee udo, zie ozi zigara eze Asịrịa nʼobodo Lakish sị ya, “Emehiela m, biko, site nʼala m pụọ. Aga m akwụ gị ihe ọbụla ị chọrọ nʼaka m.” Eze Asịrịa sitere nʼaka Hezekaya eze Juda nara narị talenti ọlaọcha atọ, na iri talenti ọlaedo atọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.