2 Ndị Eze 18

Mgbe afọ atọ gasịrị, nʼafọ nke isii nke ọchịchị Hezekaya, na afọ nke itoolu nke ọchịchị Hoshea, bụ eze Izrel, ndị agha Asịrịa dọtara Sameria nʼagha.

2 Kings 18:10 (UKJV) And at the end of three years they took it: even in the sixth year of Hezekiah, that is in the ninth year of Hoshea king of Israel, Samaria was taken.

8O tigburu ndị Filistia nʼala ha niile ruo na Gaza, na obodo dị ya gburugburu. Ọ lara obodo ahụ niile nʼiyi, obodo ukwu niile e wusiri ike na obodo nta niile a na-ewusighị ike.

9Nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Hezekaya, nke bụkwa afọ nke asaa nke ọchịchị Hoshea nwa Elaa, bụ eze Izrel, Shalmanesa, eze Asịrịa gbagoro imegide Sameria, nọchibido ya gburugburu.

10Mgbe afọ atọ gasịrị, nʼafọ nke isii nke ọchịchị Hezekaya, na afọ nke itoolu nke ọchịchị Hoshea, bụ eze Izrel, ndị agha Asịrịa dọtara Sameria nʼagha.

11Ọ bụ nʼoge ahụ ka eze Asịrịa bupụrụ ndị Izrel niile bulaa ha Asịrịa nʼime obodo Hala, na Gozan nʼakụkụ iyi ukwu Hoboa, na nʼobodo ndị Midia.

12Nke a mere nʼihi na ha jụrụ ige ntị nʼolu Onyenwe anyị bụ Chineke ha, jụkwa ime ihe ọ chọrọ ka ha mee. Ha edebeghị ọgbụgba ndụ ya na iwu niile Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere ha. Ha jụrụ ige ntị nʼiwu ndị a, maọbụ debe ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.