15Hezekaya chịịrị ọlaọcha niile ọ chọtara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na akụ niile dị nʼụlọeze, nye ya eze Asịrịa.
16Nʼoge ahụ, Hezekaya bụ eze Juda, nyakapụtachara ọlaedo niile o ji techie ibo na ibo ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, chịrị ihe ndị a niile nye eze Asịrịa.
17Eze Asịrịa sitere na Lakish zipụ ọchịagha onye ọkwa ya kasị ukwuu, onyeisi ndị na-eje ozi na ọchịagha ya na usuu ndị agha ka ha jekwuru Hezekaya na Jerusalem. Ndị agha a bịaruru Jerusalem kwụsị nʼakụkụ olulu warawara e gwuru ebe Ọdọ mmiri dị elu si nʼasọfe, nʼụzọ e si aga obosara ala ndị na-asụ akwa.
18Mgbe ha kpọrọ eze oku ka ọ bịa, Eliakịm nwa Hilkaya, onye nlekọta ụlọeze, na Shebna, ode akwụkwọ eze, na Joa nwa Asaf, onye ndekọ akụkọ ihe mere, pụrụ jekwuru ha.
19Ọchịagha ahụ sịrị ha, “Gwanụ Hezekaya: “ ‘Otu a ka eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa na-ekwu, Ọ bụ na gịnị ka ntụkwasị obi gị dabere?