19Ọchịagha ahụ sịrị ha, “Gwanụ Hezekaya: “ ‘Otu a ka eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa na-ekwu, Ọ bụ na gịnị ka ntụkwasị obi gị dabere?
20Ị na-ekwu na i nwere ndụmọdụ na ike ibu agha, maọbụ naanị egbe ọnụ ka ị na-agba. Ọ bụ onye ka ị na-atụkwasị obi mere i ji enupu isi nʼokpuru m?
21Lee, amatara m na ị na-atụkwasị obi nʼIjipt, mkpanaka achara ahụ gbajiri agbaji, nke na-adụwa aka onye ọbụla na-adabere na ya. Otu a ka Fero, eze Ijipt dị nye ndị niile na-atụkwasị ya obi.
22Ma ọ bụrụ na unu asị m, “Anyị na-atụkwasị Onyenwe anyị bụ Chineke anyị obi.” Ọ bụghị ya ka Hezekaya wezugara ebe ya niile dị elu na ebe ịchụ aja ya niile, na-asị Juda na Jerusalem, “Unu aghaghị ịkpọ isiala nʼebe ịchụ aja dị nʼime Jerusalem?”
23“ ‘Ma ugbu a, bịa kwee nna m ukwu, bụ eze Asịrịa nkwa. Aga m enye gị puku ịnyịnya abụọ ma ọ bụrụ na i nwere ike ịchọta ndị ga-agba ha.