16Tọọ ntị gị nʼala, o Onyenwe anyị ma nụrụ; meghee anya gị abụọ Onyenwe anyị, ka ịhụ; gee ntị nụkwa okwu ndị ahụ Senakerib zitere, nke o ji ekwulu Chineke dị ndụ.
17“Nʼeziokwu, Onyenwe anyị, ndị eze Asịrịa alala mba niile a dị iche iche na ala ha nʼiyi, mee ka ha tọgbọrọ nʼefu.
18Ha atụnyekwala chi ha niile nʼime ọkụ, repịakwa ha, nʼihi na ọ bụghị chi ka ha bụ, kama ha bụ naanị ihe a kpụrụ akpụ, nke mmadụ ji osisi na nkume pịa.
19Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke anyị, biko, zọpụta anyị site nʼaka ya, ka alaeze niile nke ụwa mata na naanị gị Onyenwe anyị, naanị, bụ Chineke.”
20Mgbe ahụ Aịzaya nwa Emọz zigaara Hezekaya ozi sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, Anụla m ekpere i kpere banyere Senakerib, eze Asịrịa.