2 Ndị Eze 19

Mgbe ahụ Aịzaya nwa Emọz zigaara Hezekaya ozi sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, Anụla m ekpere i kpere banyere Senakerib, eze Asịrịa.

2 Kings 19:20 (UKJV) Then Isaiah the son of Amoz sent to Hezekiah, saying, Thus says the LORD God of Israel, That which you have prayed to me against Sennacherib king of Assyria I have heard.

18Ha atụnyekwala chi ha niile nʼime ọkụ, repịakwa ha, nʼihi na ọ bụghị chi ka ha bụ, kama ha bụ naanị ihe a kpụrụ akpụ, nke mmadụ ji osisi na nkume pịa.

19Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke anyị, biko, zọpụta anyị site nʼaka ya, ka alaeze niile nke ụwa mata na naanị gị Onyenwe anyị, naanị, bụ Chineke.”

20Mgbe ahụ Aịzaya nwa Emọz zigaara Hezekaya ozi sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, Anụla m ekpere i kpere banyere Senakerib, eze Asịrịa.

21Nke a bụ okwu nke Onyenwe anyị kwuru megide ya: “ ‘Nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ Ada Zayọn na-elelị gị anya, ma jirikwa gị na-eme ihe ọchị. Nwaada Jerusalem na-efufekwa isi ya mgbe ị na-agbapụ ọsọ

22Onye ka ị kparịrị ma kwulukwaa? Ọ bụ onye ka i sitere na nganga gị welie olu okwu gị na anya gị elu megide? Ọ bụ megide Onye Nsọ nke Izrel?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.