2 Ndị Eze 19

“ ‘Ọ bụ na ị nụbeghị? Na mgbe ochie ka m kpebiri ya. Nʼụbọchị ndị ahụ gara aga ka m nọ pịa ọpịpịa ya; ugbu a, emeela m ka ọ bịa na mmezu, na ị meela ka obodo nke mgbidi gbara gburugburu, ghọọ mkpokọta nkume.

2 Kings 19:25 (UKJV) Have you not heard long ago how I have done it, and of ancient times that I have formed it? now have I brought it to pass, that you should be to lay waste fenced cities into ruinous heaps.

23I sitere nʼaka ndị ozi gị kparịa Onyenwe anyị, kwuluo ya, ị sịkwara, “Eji m ọtụtụ ụgbọala m rigoruo ebe dị elu nke nʼelu ugwu niile, nʼebe kachasị elu nke ugwu Lebanọn. Egbudasịala m osisi sida ya niile toro ogologo, na osisi junipa ya niile kachasị mma. Ejeruola m na nsọtụ niile ya, bụ ebe kachasị maa mma nʼoke ọhịa ya niile.

24Egwuola m ọtụtụ olulu mmiri nʼala ndị mba ọzọ, ṅụkwa mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ bụ ọbụ ụkwụ m ka m ji mee ka isi iyi niile dị nʼIjipt takpọọ.”

25“ ‘Ọ bụ na ị nụbeghị? Na mgbe ochie ka m kpebiri ya. Nʼụbọchị ndị ahụ gara aga ka m nọ pịa ọpịpịa ya; ugbu a, emeela m ka ọ bịa na mmezu, na ị meela ka obodo nke mgbidi gbara gburugburu, ghọọ mkpokọta nkume.

26Ndị bi nʼime ha, ndị a napụrụ ike ha nwere bụ ndị dara mba, ndị e tinyekwara nʼọnọdụ ihere. Ha dịka ahịhịa ndụ puru nʼala ubi na ome na-epupụta epupụta nakwa ahịhịa na-etopụta nʼelu ụlọ nke anwụ na-achakpọ tupu o tolite.

27“ ‘Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ marakwa ọpụpụ gị na mbata gị marakwa oke iwe gị megide m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.