2 Ndị Eze 19

Ndị bi nʼime ha, ndị a napụrụ ike ha nwere bụ ndị dara mba, ndị e tinyekwara nʼọnọdụ ihere. Ha dịka ahịhịa ndụ puru nʼala ubi na ome na-epupụta epupụta nakwa ahịhịa na-etopụta nʼelu ụlọ nke anwụ na-achakpọ tupu o tolite.

2 Kings 19:26 (UKJV) Therefore their inhabitants were of small power, they were dismayed and confounded; they were as the grass of the field, and as the green herb, as the grass on the house tops, and as corn blasted before it be grown up.

24Egwuola m ọtụtụ olulu mmiri nʼala ndị mba ọzọ, ṅụkwa mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ bụ ọbụ ụkwụ m ka m ji mee ka isi iyi niile dị nʼIjipt takpọọ.”

25“ ‘Ọ bụ na ị nụbeghị? Na mgbe ochie ka m kpebiri ya. Nʼụbọchị ndị ahụ gara aga ka m nọ pịa ọpịpịa ya; ugbu a, emeela m ka ọ bịa na mmezu, na ị meela ka obodo nke mgbidi gbara gburugburu, ghọọ mkpokọta nkume.

26Ndị bi nʼime ha, ndị a napụrụ ike ha nwere bụ ndị dara mba, ndị e tinyekwara nʼọnọdụ ihere. Ha dịka ahịhịa ndụ puru nʼala ubi na ome na-epupụta epupụta nakwa ahịhịa na-etopụta nʼelu ụlọ nke anwụ na-achakpọ tupu o tolite.

27“ ‘Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ marakwa ọpụpụ gị na mbata gị marakwa oke iwe gị megide m.

28Nʼihi ọnụma dị gị nʼobi megide m, nʼihi na mkparị gị eruola m ntị, aga m etinye nko m nʼimi gị werekwa mkpụmkpụ igwe m kpachie egbugbere ọnụ gị mee ka ị laghachi site nʼụzọ ahụ nke i siri bịa.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.