28Nʼihi ọnụma dị gị nʼobi megide m, nʼihi na mkparị gị eruola m ntị, aga m etinye nko m nʼimi gị werekwa mkpụmkpụ igwe m kpachie egbugbere ọnụ gị mee ka ị laghachi site nʼụzọ ahụ nke i siri bịa.’
29“Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama, nye gị, Hezekaya: “Nʼafọ a unu ga-eri ihe na-epu nʼonwe ya, nʼafọ nke abụọ unu ga-eri ihe ubi si na nke ahụ pupụta. Ma nʼafọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ ubi, weenụ ihe ubi; kụọ vaịnị nʼubi vaịnị, riekwanụ mkpụrụ ha.
30Ọzọkwa, ndị fọdụrụ nʼalaeze Juda ga-agba mgbọrọgwụ nʼokpuru ala, mịkwaa mkpụrụ nʼelu.
31Nʼihi na ọ bụ site na Jerusalem ka ndị fọdụrụ ga-esi pụta; otu ndị fọdụrụ ndụ ga-esitekwa nʼugwu Zayọn pụta. “Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-emezu nke a.
32“Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru banyere eze Asịrịa, sị, “ ‘Ọ gaghị azọbata ụkwụ ya nʼime obodo a maọbụ gbaa ọ bụladị otu àkụ nʼebe a. Ọ gaghị eji ọta jegharịa nʼọnụ ụzọ ama ya, maọbụ wuo mgbidi nnọchibido megide ya.