2 Ndị Eze 19

“Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru banyere eze Asịrịa, sị, “ ‘Ọ gaghị azọbata ụkwụ ya nʼime obodo a maọbụ gbaa ọ bụladị otu àkụ nʼebe a. Ọ gaghị eji ọta jegharịa nʼọnụ ụzọ ama ya, maọbụ wuo mgbidi nnọchibido megide ya.

2 Kings 19:32 (UKJV) Therefore thus says the LORD concerning the king of Assyria, He shall not come into this city, nor shoot an arrow there, nor come before it with shield, nor cast a bank against it.

30Ọzọkwa, ndị fọdụrụ nʼalaeze Juda ga-agba mgbọrọgwụ nʼokpuru ala, mịkwaa mkpụrụ nʼelu.

31Nʼihi na ọ bụ site na Jerusalem ka ndị fọdụrụ ga-esi pụta; otu ndị fọdụrụ ndụ ga-esitekwa nʼugwu Zayọn pụta. “Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-emezu nke a.

32“Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru banyere eze Asịrịa, sị, “ ‘Ọ gaghị azọbata ụkwụ ya nʼime obodo a maọbụ gbaa ọ bụladị otu àkụ nʼebe a. Ọ gaghị eji ọta jegharịa nʼọnụ ụzọ ama ya, maọbụ wuo mgbidi nnọchibido megide ya.

33Ụzọ o si bịa ka ọ ga-esi laghachi; ọ gaghị abanye nʼobodo a. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

34Aga m echebe obodo a, zọpụtakwa ya nʼihi aha m, na nʼihi Devid, bụ ohu m.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.