2 Ndị Eze 2

Ịlaisha hụrụ ya, lelie anya elu tie mkpu akwa sị, “Nna m! Nna m! Usuu ụgbọ agha na usuu ndị na-agba ịnyịnya Izrel!” Ọ hụkwaghị Ịlaịja anya ọzọ. O jidere uwe o yi nʼahụ dọwaa ya ibe abụọ.

2 Kings 2:12 (UKJV) And Elisha saw it, and he cried, My father, my father, the chariot of Israel, and the horsemen thereof. And he saw him no more: and he took hold of his own clothes, and rent them in two pieces.

10Ịlaịja zara sị ya, “Ihe ị rịọrọ bụ ihe sịrị ike omume. Ọ bụrụ na ị hụ m mgbe a na-ewepụ m site nʼebe ị nọ, ị ga-enweta ihe ị rịọrọ. Ma ọ bụrụ na ị hụghị m, ị gaghị enweta ihe ị rịọrọ.”

11Mgbe ha na-aga nʼihu nʼije ha na-akparịta ụka, na mberede, ụgbọ ọkụ nke ịnyịnya ọkụ na-adọkpụ pụtara ihe kewaa ha abụọ. Mgbe ahụ kwa oke ifufe buuru Ịlaịja rigoro nʼeluigwe.

12Ịlaisha hụrụ ya, lelie anya elu tie mkpu akwa sị, “Nna m! Nna m! Usuu ụgbọ agha na usuu ndị na-agba ịnyịnya Izrel!” Ọ hụkwaghị Ịlaịja anya ọzọ. O jidere uwe o yi nʼahụ dọwaa ya ibe abụọ.

13Emesịa, ọ chịlịri uwe mwụda Ịlaịja nke dapụrụ mgbe e weliri ya elu, laghachi bịa guzo nʼakụkụ osimiri Jọdan.

14O tiri akwa ahụ nʼelu mmiri ahụ jụọ sị, “Olee ebe Onyenwe anyị, Chineke Ịlaịja nọ?” Mgbe o tiri mmiri ahụ ihe, o kewakwara otu ụzọ nʼaka nri nke ọzọ nʼaka ekpe, Ịlaisha gafere nʼofe nke ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.