2 Ndị Eze 2

Ịlaisha zara sị ha, “Ọ dị mma, gaanụ tinye nnu nʼime efere ọhụrụ wetara m ya.” Ha gara weta efere ọhụrụ nke nnu juru nʼime ya.

2 Kings 2:20 (UKJV) And he said, Bring me a new cruse, and put salt therein. And they brought it to him.

18Ịlaisha nọ na Jeriko mgbe ndị a lọghachiri bịa kọọrọ ya otu ha si gaa. Mgbe ahụ, ọ gwara ha sị, “Ọ bụ na m agwaghị unu sị unu ejela?”

19Ndị obodo ahụ sịrị Ịlaisha, “Lee, onyenwe anyị, obodo anyị dị nʼebe dị mma, dịka gị onwe gị na-ahụ, ma mmiri dị nʼime ya jọrọ njọ, ala ya adịghị amịpụta mkpụrụ dịka o kwesiri.”

20Ịlaisha zara sị ha, “Ọ dị mma, gaanụ tinye nnu nʼime efere ọhụrụ wetara m ya.” Ha gara weta efere ọhụrụ nke nnu juru nʼime ya.

21Ịlaisha buuru nnu ahụ gaa nʼebe mmiri ahụ si asọpụta, wụnye nnu ahụ nʼime ya. Mgbe ọ na-eme nke a, o kwuru okwu sị, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Agwọọla m mmiri a. Ọnwụ maọbụ amịghị mkpụrụ nke ala agaghị adịkwa.’ ”

22Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, mmiri ahụ dịịrị ọcha ruo taa, dịka Ịlaisha kwuru.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.