20Ịlaisha zara sị ha, “Ọ dị mma, gaanụ tinye nnu nʼime efere ọhụrụ wetara m ya.” Ha gara weta efere ọhụrụ nke nnu juru nʼime ya.
21Ịlaisha buuru nnu ahụ gaa nʼebe mmiri ahụ si asọpụta, wụnye nnu ahụ nʼime ya. Mgbe ọ na-eme nke a, o kwuru okwu sị, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Agwọọla m mmiri a. Ọnwụ maọbụ amịghị mkpụrụ nke ala agaghị adịkwa.’ ”
22Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, mmiri ahụ dịịrị ọcha ruo taa, dịka Ịlaisha kwuru.
23Emesịa, Ịlaisha sitere na Jeriko pụọ ịlaghachi Betel. Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ụfọdụ ụmụ okorobịa nta sitere nʼime obodo pụta, bidoro jiri ya na-eme ihe ọchị, sị ya, “Onyeisi nkwọcha, site nʼebe a pụọ! Onyeisi nkwọcha, site nʼebe a pụọ!”
24Ịlaisha tụgharịrị lee ha anya, bụọ ha ọnụ nʼaha Onyenwe anyị. Otu mgbe ahụ, nne anụ ọhịa abụọ, a na-akpọ bịa, sitere nʼọhịa pụta, dọgbuo iri ụmụ okorobịa anọ na abụọ nʼime ha.