22Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, mmiri ahụ dịịrị ọcha ruo taa, dịka Ịlaisha kwuru.
23Emesịa, Ịlaisha sitere na Jeriko pụọ ịlaghachi Betel. Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ụfọdụ ụmụ okorobịa nta sitere nʼime obodo pụta, bidoro jiri ya na-eme ihe ọchị, sị ya, “Onyeisi nkwọcha, site nʼebe a pụọ! Onyeisi nkwọcha, site nʼebe a pụọ!”
24Ịlaisha tụgharịrị lee ha anya, bụọ ha ọnụ nʼaha Onyenwe anyị. Otu mgbe ahụ, nne anụ ọhịa abụọ, a na-akpọ bịa, sitere nʼọhịa pụta, dọgbuo iri ụmụ okorobịa anọ na abụọ nʼime ha.
25Emesịa, Ịlaisha sitere nʼebe ahụ pụọ jeruo nʼugwu Kamel. Emesịakwa, o sitere nʼebe ahụ laghachi na Sameria.