3Nʼebe ahụ, ụmụ okorobịa ndị amụma nọ na Betel pụtara zute ha abụọ. Ndị amụma ahụ bịakwutere Ịlaisha sị ya, “Ị maara na Onyenwe anyị ga-esi nʼebe ị nọ wepụ onyenwe gị Ịlaịja taa?” Ịlaisha sịrị, “Mụ onwe m maara, ma unu nọrọ nwayọọ.”
4Mgbe ahụ, Ịlaịja sịrị ya, “Ịlaisha, nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ozi ka m gaa Jeriko.” Ma ọ zara, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere ha abụọ sokwaara ruo Jeriko.
5Ndị otu ndị amụma nọ na Jeriko bịakwutere Ịlaisha nso jụọ ya, “Ị maara na Onyenwe anyị ga-ewepụ onyenwe gị taa?” Ọ zara, “E, amaara m, ya mere nọọnụ nwayọọ.”
6Mgbe ahụ, Ịlaịja sịrị ya, “Nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ka m jee Jọdan.” Ma ọ zara, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere, ha abụọ sooro na-eje.
7Iri ndị amụma ise sitere nʼetiti ndị amụma sooro ha guzoro nʼebe dị anya na ncherita ihu ebe Ịlaịja na Ịlaisha kwụsịrị nʼakụkụ Jọdan.