2 Ndị Eze 2

Mgbe ahụ, Ịlaịja sịrị ya, “Ịlaisha, nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ozi ka m gaa Jeriko.” Ma ọ zara, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere ha abụọ sokwaara ruo Jeriko.

2 Kings 2:4 (UKJV) And Elijah said unto him, Elisha, tarry here, I pray you; for the LORD has sent me to Jericho. And he said, As the LORD lives, and as your soul lives, I will not leave you. So they came to Jericho.

2Ịlaịja sịrị Ịlaisha, “Nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ozi ka m gaa Betel.” Ma Ịlaisha zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere, ha abụọ sooro gaa Betel.

3Nʼebe ahụ, ụmụ okorobịa ndị amụma nọ na Betel pụtara zute ha abụọ. Ndị amụma ahụ bịakwutere Ịlaisha sị ya, “Ị maara na Onyenwe anyị ga-esi nʼebe ị nọ wepụ onyenwe gị Ịlaịja taa?” Ịlaisha sịrị, “Mụ onwe m maara, ma unu nọrọ nwayọọ.”

4Mgbe ahụ, Ịlaịja sịrị ya, “Ịlaisha, nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ozi ka m gaa Jeriko.” Ma ọ zara, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere ha abụọ sokwaara ruo Jeriko.

5Ndị otu ndị amụma nọ na Jeriko bịakwutere Ịlaisha nso jụọ ya, “Ị maara na Onyenwe anyị ga-ewepụ onyenwe gị taa?” Ọ zara, “E, amaara m, ya mere nọọnụ nwayọọ.”

6Mgbe ahụ, Ịlaịja sịrị ya, “Nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ka m jee Jọdan.” Ma ọ zara, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere, ha abụọ sooro na-eje.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.